Poems

ANỤNỤEBE

bịa, ị bụdị anụnụebe
a naghị ekwe onye ọzọ ibe
i bee, i bechie ebe onye ọzọ ga-ebe
oge ọbụla ị na-ede
na-achọ onye gị na ya ga-ese
ka  a ga asị na gị na udo na-ese
oge ọbụla, asịrị ka ị na-ege
ihe  ọma meere onye ọzọ ka ị na-ede
nke na-eme gị, i gbarụọ ihu ka azụ-ite
dịka a ga-asị na gị na ihe ọma na-ese
….
ka  m jukene gị, i bụdị anụnụebe
ka  anyị marakwa nke anyị na-eze
alaka gị, o nweghị nnụnụ na-ebe
ogwe gi, i naghị ekwe arụrụ ibe
nke ka njọ bụ na ọ dị ka gị na dịbịa a nazị ese
nya ka m ji ajụ i bụdị anụnụebe